Psalms 8

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit.

Ịdị ebube Chineke na nsọpụrụ nke mmadụ

1O Onyenwe anyị Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile!

I meela ka ebube gị dị elu
nʼime eluigwe.
2Site nʼotuto a ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara,
ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị,
ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.
3Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe,
hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ,
mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando
i tinyere nʼọnọdụ ha,
4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha?
Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta
Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ na ihe banyere ya na-emetụ gị nʼobi
ha?

5I mere ka ha
Maọbụ, ya
dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi
Maọbụ, Chineke
nọ,
I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.
6I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke,
tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.
7Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi,
na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,
8na nnụnụ niile,
na azụ niile,
na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.

9O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.
Copyright information for IboBIU